NIMS Handbook (Igbo) - National Identity Management Commission

Transcription

NIMS Handbook (Igbo) - National Identity Management Commission
SISTEM NJIKWA NJIMARA KEMBA
SISTEM NJIKWA NJIMARA KEMBA
Ndịna
Acronyms
……..………………………………………………………………………………………………………………………………………..
2
Maka Sistem Njikwa Njimara Kemba…………………………………………………………………………………………………. 3
Sistem Njikwa Njimara Kemba “National Identity Management System” (NIMS)…………………………………… 4
Uru NIMS Bara……..…………………………………………………………………………………………………………………
5
Nọmba Njimara Kemba “The Naitonal Identification Number” (NIN)………………………………………………………6
Kedụ Mgbe M Nwere Ike Ime Ndebaaha? ……..………………………………………………………………………………… 6
Ụzọ E si Eme Ndebaaha maka NIN gị……..………………………………………………………………………………………… 8
Ọrụ Debaaha Keonwe……..……………………………………………………………………………………………………………… 8
Ọrụ Nnyemaka ……..………………………………………………………………………………………………………………………… 9
Nsirinweta Dọkụmentị Mbụ (Primary Source Documents)……………………………………………………………………. 9
Olee ihe M Ga-Eji Bịanye Mkpịsịaka M na ihe ndị ahụ Niile?..................................................................... 10
Kedụ Ka A ga-esi Chekwa Ozi Keonwe M? …………………………………………………………………………………………. 10
Mgbanwe (Mbugokwu na Mmezigharị) nye Ihendetu ……………………………………………………………………….. 11
A Ga-ahụ maka Mmasị M, sitekwa n’aka Onye? …………………………………………………………………………………. 11
Kedụ Mgbe M Ga-Enweta Nọmba Njimara Kemba “National Identification Number” (NIN) M?.................... 13
A Ka Ga-enye M Kaadị Njimara? ……..……………………………………………………………………………………………….. 14
Kedụ Oge Ọ Ga-ewe M iji Nweta Kaadị M? ……………………………………………………………………………………….. 15
Kedụ Ihe Kaadị Njimara A Ga-Eyi? ……..…………………………………………………………………………………………… 15
Kedụ ka m ga-esi were NIN na/maọbụ Kaadị Njimara m eme ihe? …………………………………………………….. 16
Gịnị ga-eme ma m Chefuo NIN M?........................................................................................................ 17
Gịnị Ga-eme ma Kaadị m Fuo maọbụ Bibie?........................................................................................... 18
M Ga-akwụ Ụgwọ maka Nnweta NIN na/maọbụ Kaadị Njimara?.............................................................. 18
Ozi na Enyemaka N’iji NIMS Eme Ihe ……..………………………………………………………………………………………
19
2
SISTEM NJIKWA NJIMARA KEMBA
THE NATIONAL IDENTIFY MANAGEMENT SYSTEM
Acronyms
CAD
CIDR
DNCR
FEP
ID
LEA
NID
NIMC
NIMS
NIN
NIS
PIA
PIVS
Card Access Devices
Central Identity Repository or Register
Department for National Civic Registration
Front-End Partners
Identity
Law Enforcement Agencies
National Identity Database
National Identity Management Commission
National Identity Management System
National Identification Number
Nigeria Immigration Service
Privacy Impact Assessment
person Identification Verification Service
3
SISTEM NJIKWA NJIMARA KEMBA
Maka Sistem Njikwa Njimara Kemba
Iwu Kemba NIMC 2007 wepụtara nhibe NIMC, ọrụ ya na ikikere ọ ga-enwe, nhibe
ikpodata kemba, ọrụ ọ ga na-arụ na etu ọ ga-esi eji kaadị ndị e ji arụ ọtụtụ ọrụ mee ihe,
ya na Kaadị Njimara Kemba “National Identification Number” (NIN) na nhazikọnụ na
ntikọtaọnụ nke ikpodata njimara dịbụ adị. Iwu ahụ nyekwara kọmishọn ikikere imebe iwu
ndị metụtara ọrụ ya. Iwu NIMC nke 2007 gụnyere ikagbu iwu hibere DNCR nke ochie na
inyefe akụ o nwere na ụgwọ o ji n’aka ndị NIMC.
Site n’ihe ndị e depụtara n’elu, e nwere ike ikewa ikikere e nyere kọmishọn a n’usoro
arụmọrụ atọ ndị pụtara ihe ndị bụ:
a) Nhibe Kọmishọn Njikwa Njimara Kemba “National Identity Management
Commission” dịka nke iwu nyere ikikere ntụziaka, maka itinye n’ọrụ atụmatụ
mmezigharị gọọmentị nwere (na sektọ njirimara) dịka ọ dị n’atụmatụ iwu kemba
na iwu NIMC, nkebi 1, 2, 5 na 6.
b) Mmechi na mweghara akụ o nwere na ụgwọ o ji ndị bụbụ DNCR ji, tinyere ndịọrụ
ha dị na steeti na Gọọmentị ime obodo alaanyị niile;
c) Nhibe, arụmọrụ, nlekọta na njikwa Sistem Njikwa Njimara Kemba “National
Identity Management system” (SIMS):
i.
idebanyeaha ụmụamala niile iwu kwadoro bi n’ala anyị dịka e nyere n’Iwu;
ii.
nkepụta na ịtinye n’ọrụ Ikpodata Njimara Kemba “National Identity
Database”;
iii.
nnyegasị ụmụamaala ndị tozuru oke na ndị iwu kwadoro ibi n’ala anyị
Nọmba Njimara Kemba “National Identification Number” (NIN) pụrụ iche;
iv.
nnyegasị nwaamala ọbụla bido n’afọ iri na isii gbagowe e debanyerela aha
ya, kaadị mbuakọnuuche “Smart Card” e ji arụ ọtụtụ ọrụ.
v.
Iwepụta ụzọ e chedoro nke ọma, Mwepụta maka ịbanye n’Ikpodata
Njimara Kemba “National Identification Database” ka onye ọbụla nwee ike
ịkọwa onwe ya n’enweghị mgbagha.
vi.
Nhazikọọnụ na ntikọtaọnụ Ikpodatà njimara keotu ndị na-arụrụ gọọmentị
ọrụ iji nweta n’ụzọ kachasị elu uru sitere n’ọrụ arụgasịrị;
Njikọtaaka nke ndị ngalaba ọrụ keonwe (private sector) na/maọbụ ngalaba
vii.
ọrụ keọha (public sector) maka imezu ebumnuche MIMS;
viii.
Na njikọaka nke Kọmịshọn Na-ahụ maka Ọnụọgụ Kemba “National
Population Commission” idebanye ndị a mụrụ na ndị nwụrụ anwụ.
4
SISTEM NJIKWA NJIMARA KEMBA
SISTEM NJIKWA NJIMARA KEMBA “NATIONAL IDENTITY MANAGEMENT
SYSTEM” (NIMS)
ọrụ gbasara sistem njikwa njimara kemba (The National Identity Management System –
NIMS) bidoro n’ime kwọta nke atọ n’afọ 2009, mgbe Kọmishọn Njikwa Njimara Kembà
(National Identity Management Commission – NIMC) chọpụtara na o nweghi ike iwere
ngwaọrụ o ketara n’aka DNCR mee ihe ọbụla ọzọ.
N’ime ọnwa ole na ole na-abịanụ, e nwere olileanya na nwaamala ọbụla na ọbịa ọbụla iwu
kwadoro obibi ya ga-enwe ike idebanye aha n’ime ya bụ sistem. Dọkụmenti a, kọwara
ebumnobi NIMS na uru onye ọbụla, gọọmentị na ọhaizugbe ga-enweta na ya.
NIMS gụnyere Ikpodata Njimara Kembà (National Identity Database) nke a na-akpọkwa
(Central Identity Repository or register, CIDR), ikpo chip, kaadị njimara echekwara na
netwọọk mbanye na ụzọ enweghi mgbagha iji egosịpụta onye bụ onye. Ọ gụnyekwara
nhazikọọnụ ikpodata dị adị na ngalaba ọrụ keọha (public sector). Ihe kachasị mkpa
gbasara NIMS bụ na ọ ga-ewepụta akọrọngwa njimara òzùrùụ̀ wà (Universal Identification
Infrastructure) maka ala anyị niile.
Nke a ga-ewetara ndị gọọment, onye ọbụla n’ime anyị na ndị ọbịa iwu kwadoro ibi n’ala
anyị ezigbo ihe ọma pụtara ìhè.
Uru NIMS Bara
Mgbe NIMS bidoro ọrụ n’uju, ihe ndị ọ ga-eme gụnyere:
a) Iwepụta ụzọ enweghi nsogbu na ụzọ dị mfe a ga-esi na-edeba aha ndị mmadụ n’ime
Ikpodata Njimara Kemba (National Identity Database), bụ ebe a ga-esi nye ndị
mmadụ kaadị njimara kembuakọnuche (smart card) na Nọmba Njimara Kemba
(National Identity Number – NIN).
b) Inye aka chedo njimara gị, n’aka ohi na mpụ site n’iwepụta ụzọ dị mfe, ndabere, naadịgide nakwa ụzọ nzuruụwa ọnụ nabatara ị ga-esi na-amata mgbe ọbụla ma njimara
gị ọ ka dịkwa etu ọ dị.
c) Ime ndụ ka ọ dịkwuo mfe, site n’iwepụta ụzọ dị mfe i nwere ike isi chọpụta ma
njimara gị ọ dịkwa etu o kwesịrị n’ebe ọbụla na Naịjirịa ma na mba ọzọ.
d) Inye aka mezigharịa usoro ọchịchị anyị site n’ịkwalite akaọrụ ndị ọrụ ha bụ ịchịkwā
usoro nhọpụta ndịọchịchị.
e) Ime ka o sikwuoro ndịòmèkàòmè ike iji njimara adigboroja maọbụ iwere karịa otu
njimara na-eme ajọ ihe. Nke a ga-enyere gọọmenti aka, site n’ịkwalite arụmọọrụ
ndị ọrụ gọọmenti na-amanye iwu “Law Enforcement Agencies” (LEAs) ka ha chedo
anyị n’aka òmèkàòmè, ọkachasị ndị i wèrè nke a i rie m ego na ndị myija.
f) Ịmasigharị anyị niile obi ike na ndịọrụ gọọmenti bụ ndị ha sị na ha bụ, agaghị
enwekwa ndị na-anara ego na-arụghị orụ.
5
SISTEM NJIKWA NJIMARA KEMBA
g) Inyere anyị aka dịka ḿbà na ijikwa ego mba ala anyị ọfụma, wee hụ na orutụrụ onye
ọbụla, ịkwadokwu sistem ndị nzụrụ si enweta ego azụmahịa nke ga-enye aka mee ka
akụnaụba anyị tolite; iwepụta ohere ewemnọrụ ma kwalitekwa ogo obibindụ ndị
Naịjirịa.
h) Inye aka hazikọọ ma tinyekọọ ikpodata njirimara (Identity databases) n’ụlọọrụ ndị
gọọmentị nwe (nakwa n’ụlọọrụ ndịọrụ keonwe nwe); iji ego gọọmentị rụọ ọrụ n’ụzọ
kachasị elu, ka o wee bụrụ na akwalitere nrụsiọrụ ike na gburugburu ala anyị;
i) Ịkwalite na inye aka mee ka usoro niile ndị gọọmentị si enweta ego nakwa ịkwụ
ụ̀ tụisi dịkwuo mfe n’ihi na njimara onye ọbụla ga-adi mfe n’ịchọpụta.
j) inye aka mechapụ Naịjirịa ihu maka na ndị Naịjirịa nwere ike gosịpụta njimara ha.
Ọ bụ atụmatụ ọrụ ga-ewe ọtụtụ oge, ọzọkwa, ụfọdụ uru ndị gbara ọkpụrụkpụ maka ala
anyị dum ga-apụta ihe mgbe imirikiti mmadụ debanyere aha ha. Ka ndị mmadụ debaara
aha n’ikpodata njimara kemba na-abanwaye ka uru si na ya na-abawanyekwa. NIMS
gosipụtara mbugharị ọnọdụ; ugbua, ọ bụghị naanị n’inye kaadị njimara ka uche anyị dị
kama anyị tinyere uche karịa na njikwa njimara awa iriabụọ na anọ kwa ụbọchị (24 x 7).
Nọmba Njimara Kemba “The Naitonal Identification Number” (NIN)
Nọmba Njimara Kemba “The National identification Number” (NIN) bụ nọmba nkịtị a naenye onye ọbụla mezuru ndebaaha. Ndebaaha gụnyere ime ndetu ihe gbasara ndụ onye
ọbụla, na iseta mbịanye mkpịsịaka iri (10), foto bidoro n’isi ruo n’ubu na mbianyeaka
kedijitaal, bụ ndị a na-ejicha elebagharị anya na datà ndị dịbụ n’Ikpodatà Njimara Kemba
“National Identiy Database” iji kwenye na e nwebughị ndenye data ahụ e meburula.
Ozigbo e mechara usoro nlebagharị anya hụ, e tibanye datà na NIN pụrụ iche e nyere ya
n’ikpodatà njimara maka iji eme ihe n’ọdịnihu.
A naghị enyekwa onye ọzọ NIN e nyeburula mmadụ, ọbụladị ma onye enyeburu ya
anwụọla. Ọ bụ NIN na-enye aka ijikọta ihe niile gbasara mmadụ n’ikpodatà, bụrụkwa ya
ka e ji achọpụta nke bụ eziokwu gbasara njimara mmadụ.
Kedụ Mgbe M Nwere Ike Ime Ndebaaha?
Ndebaaha ga-ebido ozugbo ndị “Front-End Partners” (FEPs) dị njikere. Mana ndebaaha
ga-ebido n’ebe ndị a họọrọ n’afọ 2011. Yabụ, a ga-achọ ka i weta datà ihe niile gbasara gị
mbịanye mkpịsịaka, Foto, na mbịanyeaka kedijitaal maka ndebaaha n’ime Ikpodatà
Njimara Kembà (National Identity Database), site n’ije n’ebe e wepụtara maka ọrụ
ndebaaha mgbe i nwere ohere. E nwere ohere ndebanyeaha a ga-eme ọnlaịn tupu
ndebaaha kpọmkwem. A ga-enye gị NIN n’ime òtù (1) izuụka ma ọ bụrụ na e nweghị ihe
mgbagwojuanya gbasara njimara gị. E mechaa, a ga-eme kaadị njimara gị, zitere gị ya
n’ime otù (1) ọnwa.
6
SISTEM NJIKWA NJIMARA KEMBA
7
SISTEM NJIKWA NJIMARA KEMBA
Etu ọ dị, ọ bụrụ na e nwere mgbagwojuanya gbasara ndebaaha gị, a ga-eme ka ị mara
n’ime áwà irianọ na asatọ (48) i ji mechaa, e nwekwara ike sị gị bịa n’ụlọọrụ ndebaaha
maka imekwu nchọpụta gbasara gị.
Ụzọ E Si Eme Ndebaaha maka NIN gị
Nwaamala ọbụla bido n’afọ iri na isii gbagowe nakwa ndị ọbịa iwu kwadoro obibi ha nwere
ike ime ndebaaha maka NIN. Usoro ya ga-abụ otu, ma i
kpebiri iwere imere ya onwe gị maọbụ na ị họọrọ nnyemaka.
(Ugbua, a na-atụ atụmatụ maka ndebaaha onye ọbụla mgbe a
mụrụ ya nakwa imezu ndebaaha kebayometriks mgbe ọ gbara
afọ ise (5).
Omendebaaha na-edebanye aha Ọchọndebaaha nwaanyị
maka inweta Nọmba Njimara Kemba “National Identification Number” (NIN)
Ọrụ Debaaha Keonwe
Maka ọrụ keonwe, ị ga-enwe ike ideba aha tupu n’ọnlaịn site n’inweta Fọm Ndebaaha site
na NIMC weebsait: http://www.nimc.gov.ng, maọbụ Ụlọọrụ Ndebanyeaha ọbụla. Denye
ọfụma n’ime fọm ahụ ihe ndị ọ bụ iwu na ị ga-edepụta, ya na ihe ndị ọzọ ha chọrọ, ma
bipụta Ihuakwụkwọ Nchikọta nke bu Baakoodu 2D na Nọmba 1D Ndebanyeaha
“Registration 1D Number” I ga-ewere Ibeakwụkwọ nchịkọta a gosị
Omendebaaha nọ n’Ụlọọrụ Ndebanyeaha dị n’ebe i bi bụ onye ga-enyochapụta ma kwenye
na datà dị n’ime sistem dabara; e mechaa, a ga-esere foto, mbịanyemkpịsịaka na
mbịanyeaka gị.
A ga-achọ ka ị gosị nsirinweta dọkụmentị izizi nke ga-enyere Omendebaaha aka
inyochapụta ihe ndị i kwuru tupu e deba aha gị n’uju na NIMS. Dọkụmentị dị etu a
gụnyere, asambodo ọmụmụ gị, ihengosị adreesi ebeobibi na ogoakwụkwọ, dgz.
Ọrụ Nnyemaka
A bịa n’ọrụ kennyemaka, a ga-achọ ka i were fọm Ndebaaha site n’Ụlọọrụ Ndebanyeaha
“Registration Centre” mọọbụ Ụlọọrụ Ndebanyeaha Kengagharị “Mobile Registration
Centre” ọbụla denyesịa ihe ndị a chọrọ n’onwe gị mọọbụ rịọ enyemaka Osoje Onyeisiukwu
“Executive Assistant” mọọbụ Onyeọrụ Nnyemaka “Support Officer”.
A gazi enye
Omendebaaha fọm bụ onye ga-etibanyeju data n’ime sistem. Ị ga-enyochagharị ma
kwenye na ndebaaha dị na sistem dabara. E mechaa, e sere foto mbịanyemkpịsịaka na
mbịanyeaka gị.
Na ngwụcha ime ndebanyeaha, a ga-anabata ndebaaha gị, e wee bipụta slip nye gị iji gosị
na ị mechaala ndebaaha. Nke a ga-eneyere gị aka inweta ID ị ga-eji na-ama ka ihe si
8
SISTEM NJIKWA NJIMARA KEMBA
kwụrụ tupu i nweta NIN gị nakwa kaadị ID ga-esote ya. (A ga-ewepụta ụlọọrụ ebe a ga
na-akpọtụrụ maka ihe gbasara NIMS)
Nsirinweta Dọkụmentị Mbụ (Primary Source Documents)
Mgbe a na-eme ndebaaha, e nwere ike ịmata ịdị mma data naanị site na dọkụmentị ndị
mbụ kwadoro ihe nwaamaala maọbụ onye ọbịa iwu kwadoro obibi ya gosịrị. A gaenwekwa kọpị dọcụmentị ndị ahụ ma ọ dị mkpa, ji ha mee nnyochapụta nke bụ kpoo ka ọ
ga-abụ e mechaa Omendebanyeaha nọ n’Ụlọọrụ ndebanyeaha emee ya skaan chekwaa
maka iji mee nnyocha etu o kwesịrị.
N’ebe ọ gbasara ụmụamaala nà ndị iwu kwadoro obibi ha n’enweghị dọkụmenti, a ka gaedeba aha ha, nye ha NIN ma a ga-ede ihe na-egosị na e nweghị dọkụmenti nkwadoha
wetara. Usoro ahụ dị mkpa maka iji mee nnyocha kaadị njidetu keonye nakwa maka
igafere nnyocha ndinche.
A bịa n’Ụlọọrụ Ndebanyeaha ndị e nwere n’obodo na ogbe ndị nọ n’okè, Onyeọrụ nke Ọrụ
Imigreshọn Naịjirịa “Nigeria Immigration Service” (NIS) nọkarịrị nso n’ụlọọrụ NIS gaenyocha ndị niile na-ekwu na ha bụ ụmụamaala tupu e nye (ha) kaadị.
Olee ihe M Ga-Eji Bịanye Mkpịsịaka M na ihe ndị ahụ Niile?
I ga-etinye ozi gbasara ndụ gị na data bayometriks gị
maka na n’okpuru sistem Nọmba Njimara Kemba
“National Identification Number” (NIN), a na-eji nọmba
ọbụla e nyere gị gbachikọta ihe niile e jiri mara gị n’ụzọ
keeletriik ndị ga-ahịa ahụ maọbụ nke a pụghị
ịghọ̀ ghàrà, izuru, ichefu maọbụ ịtụfu bụkwa nke e tinyere mwekọta ọdịdị ahụ gị pụrụ iche
iji ihendekọ keeletriik esere ihu na mbịanyemkpịsịaka gị. Ọzọkwa, ọ bụrụhaa na anyị
sekọrọ mbịanyenkpịsịaka na foto ihu gị, o ghaghị adị mkpa ime ya ọzọ ruo mgbe afọ ise
(5) ọzọ gasịrị. N’ọdịniihu, a ga-achọ ka e mee skaan nke mkpụrụanya gị mgbe e wepụtara
NIMS n’uju. Data bayometriks gị bụ ọpụrụiche nye naanị gị; ọ bụ ya bụ ntọala nke sistem
njimara a pụrụ iche.
Kedụ Ka A ga-esi Chekwa Ozi Keonwe M?
A ga-echekwa ozi keonwe gị n’Ikpodata Njimara Kemba
“National Identity Database” n’ụzọ ihe agaghị emebi ya.
I ga-enwe ike iji ya mee ihe ebe ọbụla na Naịjirịa mgbe
ọbụla ị chọrọ ịkọwa onye ị bụ. E nweghi onye maọbụ
òtù ga-enweta ohere ịhụ ozi gị dị n’ikpodata na-ebughi
ụzọ nata nkweta gị na enyemikike zuru oke nke NIMC.
Etu ọ dị, Iwu NIMC hibere òtùọrụ gọọmentị ndị na-ahụ maka nchedo na mpụ gbasara ego,
ndị a ga-eme ka ha nweta ozi gbasara gị na-ebughi ụzọ nata nkweta gị. Ha gụnyere
9
SISTEM NJIKWA NJIMARA KEMBA
Ndịọrụ Nchedo Kesteeti “The State Security Service” Kọmishọn na-ahụ maka Mpụ
Akụnaụba na Ego (Economic and Financial Crimes Commission), Ndị Uweojii Naịjirịa, dgz.
Ma etu ọ dị, ọ bụ iwu na ha ga-agarịrị n’ụlọikpe nata ikike maka inweta ozi metụtara gị. Ọ
bụ naanị onye ọkwaọrụ ya dị elu n’ òtùọrụ ndị ahụ nwere ike ịrịọ maka ozi dị etu ahụ
n’ụlọikpe.
Mgbanwe (Mbugokwu na Mmezigharị) nye Ihendetu
Ị ga-enwekwa ike ime mgbanwe n’ihendetu gị. Iji maa atụ, ọ bụrụ na ị gbanweela aha
nna gị zawa aha di gị, dịka i mere n’oge izizi i debara aha na sistem, ị ga-eme ndeba
n’akwụkwọ Mgbanwe Ihendetu Keọnlaịn dị na weebsaịt anyị, bipụta nchịkọta ndebaaha
ahụ n’ibe akwụkwọ, wega ya n’Ụlọọrụ Ndebanyeaha, maọbụ i dejuo akwukwọ Mgbanwe
Ihendetu n’Ụlọọrụ Ndebanyeaha ọbụla. Ozigbo Omendebaaha nyochapụtara na onye ị bụ
na ihendetu ndị e nweburu enwebu makọrọ, a ga-eme mbugokwu ị chọrọ, ebe a gaedebakwa ihe niile ahụ n’ihendetu ochie gị iji nye gị ohere inweta ihe ị chọrọ ma ihendetu
ochie gị ka dị mkpa.
A Ga-ahụ maka Mmasị M, sitekwa n’aka Onye?
Tupu sistem ncheremee NIN abịa na njedebe, NIMC mere Iheọmụmụ nke Nnwale
Mmetụta Kenzoroonwe “Privacy Impact Assessment (PIA) Study” iji ọ bụ ihe na-eweta
mgbanwe na ndụ: deba aha otu ugboro ka a mara onye ị bụ na ndụ gị niile.
aghọta okere ọghọm kenzoroonwe na mmasị mmadụ nwere nakwa etu a ga-esi ahụ maka
ha.
E tibanyela ihemmụta ndị sitere n’iheọmụmụ a na ncheremee nke NINS, ọkachasị, keusoro
nchekwa data.
Ọrụ dịirị NIMC ga-agụnye nlekọta ozi ndị dị n’Ikpodata Njimara Kemba (National Identity
Database) iji hụ na ha dabara, zuo oke, ma nwee nchedo. E wezuga ịdị na-akpịnye anya
n’usoro ndebaaha, NIMC ga na-elebanye anya kwamgbe kwamgbe n’etu e si eji NIN na
Kaadị Njimara Kemba (National Identity Card) na-eme ihe. Ọ bụ ezie na a ga-enwe
Ụlọọrụ Mkpọtụrụ (Contact Centres) ebe ndịọrụ Sektọ keonwe (Private Sector) ga-ahazi,
NIMC ga-enwe nlekọtaọrụ kwụ chịm banyere usoro nhazi/ndozi mkpasuiwe a.
Oherembanye n’Ikpodata Njimara Kemba (Access to the National Identity Database) dị
n’usoro ma nwee nchedo. A ga-eme ka nke a dịrị n’iru aka nke ndịòtùọrụ gọọmenti na ndị
a họpụtara inye Ọrụ Nnyochapụta Njimara (Identity Verification Service).
Ikike
oherembanye NIMC nyere ndịọzọ abụghị ndịọrụ ga-enwe nchedo dị ukwuu. Òtùọrụ
gọọmenti ọbụla maọbụ ndịọrụ sektọ keonwe a haziri na-eji NIMS arụ ọrụ ka a ga-achọ ka
ha wetara NIMC ozi gosịrị etu ha si echekwa ozi njimara na etu ha na-esi eji NIN na Kaadị
Njimara Kemba na-arụ ọrụ maka nnyochapụta njimara site n’oge ruo n’oge.
E chere mee NIMS itibanye mmekọrịta na/maọbụ ajụjụ niile (audit log) n’Ikpodata Njimara
Kemba (National Identity Database), tinyere ihe ndị na-eme ka e kee nkwụcha, mata
mgbe a chọwara ime mpụ. Ndị otuọrụ gọọmentị, òtù maọbụ ndị niile dị icheiche na-eji
10
SISTEM NJIKWA NJIMARA KEMBA
11
SISTEM NJIKWA NJIMARA KEMBA
NIMS arụ ọrụ ka a ga-amanye ka ha mee ihe a chọrọ maka ozi sitere na NIMC, etu na
mgbe ọ dịrị mkpa dịka ọ dị n’ụsoro nke Iwu NIMC kwesịrị.
NIMC achịkọtakwala Atụmatụọrụ Keọnọdụ Nzoroonwe “Privacy Policy” dịka ngwaọrụ
kwesịrị ekwesị maka ịhụ na e kpuchitere orubeere onye keọnọdụ nzoroonwe na mwekọta
nke ozi e debanyere, arụmọrụ na njikwa nke ikpo data na iji NIN na Kaadị Njimara Kemba
(Natioanl ID Card) arụ ọrụ. Dịka o kwesịrị, NIMC dị njikere ichekwaba ọnọdụ nzoroonwe
gị. N’ọdịnihu, NIMC ga-ahụ maka imezigharịkwu iwu ndị ga-ekpuchite data na ọnọdụ
nzoroonwe.
Kedụ Mgbe M Ga-Enweta Nọmba Njimara Kemba “National Identification
Number” (NIN)?
E chere mee eserese NIMS n’etu a ga-esi nweta NIN gị ozigbo usoro ndebaaha na
mmepụtagharị ya n’ụbara bịara na njedebe. Ebe ọ bụ na usoro mmepụtagharị na-ewe
ntabianya olenaole, NIN gị ga-adị njikere na ntabianya olenaole. Ụzọ nzigaozi nke ị họọrọ
ga-ekpebi etu ị ga-esi enweta ya ọsịisọ. Yabụ na i nwere ike inweta NIN nke gị nime
ntabianya, nkeji, awa maọbụ ụbọchị olenaole site n’ụdị nzịgaozi NIMC ị họọrọ; ọrụ nke
SMS, ọrụ nzigaozi kurịa maọbụ ọrụ E-meel.
A Ka Ga-enye M Kaadị Njimara?
Éē a ka ga-enye gị kaadị njimara. Ma n’oge a, ọ ga-abụ kaadị ga-enye gị n’ụzọ doro ahụ,
baakwa uru ị ga-esi gosịpụta njimara gị n’ụdị na n’ọnọdụ ọbụla. Ọ ga-enyekwara gị aka
ime ihe ndị ọzọ maka na a ga-enwe ụzọ e si akwụ ụgwọ na ya. NIMS a ga-ewepụtakwa
ụzọ ndị ọzọ i nwere ike isi gosịpụta njimara gị na-ejighị Kaadị Njimara nke gị.
Ugbua, ndị mmadụ na-eji ụdịrị dọkụment foto-ID dị icheiche maka egosịpụta njimara ha
tinyere: ID keonyeọrụ (staff ID), Ikike Ọkwọụgbọala (Driver’s Licence), Ntaneshọnal
Paspọọt (International passport) bụ (e-passport), dgz. Oge ụfọdụ, iji dọkụmenti ndị a gaeme ka ị nyepụ ozi ndị ọzọ gbasara gị karịa ka o kwesịrị maọbụ ka a chọrọ. N’ihe fọdụrụ
ntịị ka ọ burụ oge dum, a naghị ekwute ihe gbasara onye nyere maọbụ ebe e siri nweta
dọkụmenti njimara ahụ. Oge ụfọdụ a na-elenyetụ anya naanị ijimata ma foto dị na
dọkụmentị njimara o yiri onye ahụ ji ya. Ọkarịa ike, n’ụlọakụ, a na-ewere foto onye ji ya
na dọkụmenti njimara ahụ e mepụtagharịrị dokwaa. Nke a bụ ụzọ a na-esikarịcha
enyochapụta njimara n’ala Naịjirịa niile ka ọ dị ugbua. Ọ bụghị ezigbo ụzọ dị mma iji
enyochapụta njimara, nke mere e ji enwe nzuru njimara na mpụ ndị dịka ya na-abawanye.
Ịga n’ihu, site n’ogo nnabata njimara a chọrọ maka otu mmekọrịta a kpọrọ aha, a ga-eleba
anya
12
SISTEM NJIKWA NJIMARA KEMBA
na njimara mmadụ site n’iji anya nkịtị tụnyere foto dị na Kaadị Njimara na ihu onye ahụ,
maọbụ site n’itibanye, NIN n’akọrọngwa weeb nke bụ na a ga-ewere ozi e tinyeburu
gbasara ya kwenye na ọ bụ njimara ya; maọbụ iji skaan sere mbịanyemkpịsịaka a
mapadoro na chiip dị na kaadị site n’iji “Card Access Device (CAD)”; maọbụ maka ogo
nnabata kachasị dị elu; e mee nlebaanya n’Ikpodata Njimara Kemba, site n’iji skaan sere
mbịanyemkpịsịaka nke e nwere ike ime n’ọnlaịn/n’oge ya kpọmkwem na ọ bụnaa n’ọflaịn .
Nchedo na ágwárā NIMS ndị ọzọ nakwa Kaadị Njimara “ID Card” ga-adakọ n’Ogo
Kembaụwa (International Standard) dị icheiche (ISO 27001, ICAO 9303).
Kedụ Oge Ọ Ga-ewe M iji Nweta Kaadị M?
Ọ na-ewekarị otù (1) ọnwa iji mee ka kaadị rute onye nwe ya. Mana ọ ga-ewe ihe dịka
otù (1) izuụka iji mepụta kaadị ahụ. Ọ ga-ewe oge erughi (izùụka abụọ) ma ọ bụrụ na i
jee nara ya n’onwe gị. NIMC na-ahazi ụzọ dị mfe isi ezigara ndị mmadụ kaadị ha site na
nzipụozi kurịa. Nke a pụtara na a achọrọ oge iji hụ na enyeruru kaadị n’enweghị nsogbu.
A ga-eme “nchedo” na “ikike nnyepụ” keikpeazụ tupu e wepụta kaadị maka iwegara ya
onye nwe ya. A gaghị anabata inye ID kaadị nnyeru. Ihe dị mma na ya bụ na i nwere ike
ịgbaso ka ọrụ mmepụta kaadị gị si aga. A ga-enwe ụlọọrụ Mkpọtụrụ (arụmọrụ awa 24) iji
nyere gị aka mee nke a. A ga-ezitere gị ozi site n’ozi-meel maọbụ “SMS” n’ekwentị gị
ngwangwa ọ dịrị njikere.
Kedụ Ihe Kaadị Njimara A Ga-Eyi?
Ejirimara ncheremee niile dị na Kaadị Njimara Mbuakọnuche Kemba (National Smart
Identity Card) ga-adaba n’ogo a tụrụ anya e si enwe ya na mbaụwa niile. Eserese
ọmụmatụ ka e gosịrị n’okpuru. E zipụtaghị ejirimara mkpuchite na ụcha n’ebe a n’ihi ihe
ndị onye ọbụla maara.
A ga-enwe chiip nke ga-ebu ozi keonye kpọmkwem, NIN, mbianyeaka na nzipụta
mbịanyemkpịsịaka gị zuru oke, ga-eme ka e mee nnwapụta na nkwepụta njimara site n’iji
nke ọbụla n’ụzọ ndị e wepụtara. E nwere ọtụtụ akọrọngwa nchedo ndị a rụnyere n’ime
kaadị a iji hụ na ewepụtaghị adịgboroja ya. Ọzọkwa, a na-enye agbamume maka ibipụta
ya n’obodo anyị a iji hụ na e mechara ya n’oge e kwere na nkwa wee nye aka ka e nwee
ohere ewemnọrụ n’ime obodo. Kaadị Njimara (Mbuakọnuche) Kemba (The National
Identity (Smart) Card) ga-adị etu a:
13
SISTEM NJIKWA NJIMARA KEMBA
Kedụ ka m ga-esi were NIN na/maọbụ Kaadị Njimara m eme ihe?
E nwere ọtụtụ ọnọdụ a ga-achọ ka i gosị na ị bụ onye ị sị na ị bụ.
NIN na/maọbụ Kaadị Njimara Kemba (National Identity Card) gaenye gị ohere ime nke a n’ọtụtụ ụzọ onye ọbụla ga-anabata.
Ụbọchị ọbụla, ị na-eme otu ihe maọbụ nke ọzọ ga-achọ ka ị kọwaa
onye ị bụ maọbụ ọnọdụ akwụmụgwọ ga-achọ ka i kwupụta onye ị
bụ n’ụzọ dị mfe maọbụ ọnọdụ ndị ọzọ ebe a chọrọ nkwụdosiike kachasị n’ihe ị na-akọwa
tinyere ndị ahụ e depụtara na Nkebi 27 nke ịwụ NIMC, 2007. N’ọnọdụ a, e nwere ike ịmata
onye ị bụ site n’ilenye anya n’Ikpodata Njimara Kemba site n’ọrụ weeb mgbadoụkwụ
maọbụ akọrọngwa ǹchọpụ̀ ta kaadị.
Usoro akọrọngwa nchọpụta kaadị nke e gosịrị n’elu ebe a ka a na-eme mgbe e tinyere
kaadị njimara mmadụ n’ime “Card Access Device” (CAD), onye ahụ ewetazie skaan
mbịanyemkpịsịaka ya. E ji nke a elezima mbịanyemkpịsịaka nke e dobeburu na chiip dị na
kaadị, ọ bụkwa ya n’ezie. Usoro mnwepụta nke gbadoro ụkwụ na weebụ nwere ike ịbụ
ezi mwepụta keoge site na njikọta ọrụ intaneeti nakwa ohere ibanye na ikpodata. N’akụkụ
nke ọbụla azịza ga-abụ ịsa Ee/Mba nye òtù na-ajụ ajụjụ. E nwere ike inweta ozi ndị ọzọ
maọbụ ọdịdị nke ọrụ a na-ekwu maka ya.
Nkebi 27 nke Iwu NIMC, 2007 tụpụtara na, n’ụbọchị kọmịshọn ga-ekwupụta, iji Nọmba
Njimara Kemba “National Identity Number” (NIN) rụọ ọrụ ga-abụ iwu nye onye ọbụla ime
ihe ndị a:
a) ideba akwụkwọ maka inweta ntanashọnal Paspọọtụ;
b) imepe akantụ keonwe n’ọbaego;
c) ịzụ pọlisì ndị nshọọransị;̀
d)
e)
f)
g)
h)
i)
j)
k)
l)
n’ịgbado ụkwụ n’ihe e nwere n’Iwu Iji Ala Eme Ihe maọbụ “Land Use Act”, nzụrụ,
inyefe na ime ndebanyeaha ala nke mmadụ mere maọbụ ihe ndị ọzọ metụtara ya;
ụdịrị mmekọrịta ndị ahụ gbasara ụmụmmadụ dịka ndị nke Iwu Mmezigharị Ụgwọ
Ezumike Nka “Pension Reform Act” nke 2004 tụpụtara ma hụ na e mere ha;
ụdịrị mmekọrịta ndị ahụ a kọwapụtara n’okpuru Atụmatụ Ntụkọ ụtụ nke Nshọransị ̀
Ahụike “Contributory Health Insurance Scheme”;
ụdịrị mmekọrịta ndị ahụ etụtara nchedo keọhaizugbe;
mmekọrịta niile ga-aba uru nye ndị ji ha eme ihe;
ndebanyeaha nke ndị na-atụ vootu;
akwụmụgwọ ụtụisi;
Ọrụ ndị ahụ dị mkpa na gọọmentị; na
ụdịrị mmekọrịta ọbụla ọzọ nke kọmịshọn nwere ike tụpụta ma desịta na Gazeeti
nke Gọọmentị Etiti.
14
SISTEM NJIKWA NJIMARA KEMBA
Gịnị ga-eme ma m Chefuo NIN M?
Ọ bụrụ ma i chefuo NIN gị, i ka nweere ike inweteghachi ya site n’Ụlọọrụ Ndebanyeaha
(Registration Centre) maọbụ idenyeju Fọm Arịrịọ Ozi NIN (NIN Information Request Form)
ma were ya jee n’Ụlọọrụ Mkpọtụrụ (Contact Centres) ọbụla nke ndịọrụ Keonwe ga na-arụ
oge ọbụla n’ụbọchị dị n’izuụka (24/7).
Gịnị Ga-eme ma Kaadị m Fuo maọbụ Bibie?
Ọ bụ ọrụ dịirị onye ọbụla ichekwa Kaadị Njimara (Identity Card) ya ma dote ya n’ọnọdụ dị
mma. Etu ọ dị, ị pụrụ ikpesara ụlọọrụ NIMC ọbụla dị n’ala anyị ma o nwee ka i siri chee
na kaadị ahụ abụrụla ihe e mere ntụfu, nzuru, mbibi, nrọtọ maọbụ mmebi. NIMC gaakagbu kaadị ahụ n’ime sistem (n’ụzọ nke bụ na) o nweghi onye ọzọ ga-enwe ike iji ya
eme ihe n’ọnọdụ ọbụla a ga-achọ ịchọpụta adịmìrè ya. Ka ọ dịgodu, maka ihi na NIN gị
bụ ọpụrụiche nyere naanị gị, o nweghi onye ọbụla ọzọ nwere ike iji ya eme ihe.
Etu ọ dị, ị chọọ ime nnweghachite, ị ga-etinye akwụkwọ n’Ụlọọrụ Ndebanyeaha NIMC
“NIMC Registration Centres” nke FEPs na-ahụ maka ya. Ị ga-edenyeju ihe a chọrọ na fọm
arịrịọ maka Nnweghachite Kaadị nke a ga-eme n’ọnlaịn (online) site na weebsaịt anyị,
bipụta ibe akwụkwọ nchịkọta ya ma were ya jee n’Ụlọọrụ Ndebanyeaha (Registration
Centres) maọbụ dejupụta ihe a chọrọ na fọm arịrịọ maka Nnweghachite Kaadị n’Ụlọọrụ
Ndebanyeaha (Registration Centres) ọbụla. Omendebanyeaha ga-enyocha njimara gị na
nke dịbu adị n’ihindekọta. Ngwangwa e mechara nnyochapụta, usoro nnweghachite kaadị
nke agaghị eweru oge o were iji nweta nke mbụ (abalị 7) ga-amalite. A ga-achọ ka ị
kwụọ ụgwọ maka nnweghachite kaadị.
M Ga-akwụ Ụgwọ maka Nnweta NIN na/maọbụ Kaadị Njimara?
Ndebaaha, ndebanyeoziaha, nnyepụ NIN na Kaadị Mbuakọnauche (smaat) Kemba bụ
n’efu. Etu ọ dị, ọ bụrụ na i tụfuru, mebie maọbụ bibie kaadị nke izizi e nyere gị, a ga-achọ
ka ị kwụọ ụgwọ maka kaadị nnweghachite.
A ga-akọwado anya gbasara ego
nnweghachite ahụ, na-elenyeghachikwa ya anya site n’oge ruo n’oge.
Ozi na Enyemaka N’iji NIMS Eme Ihe
Ugbua a na-agba mbọ ihibe Ụlọọrụ Mkpọtụrụ ebe ndịọrụ keonwe ga na-arụ ọrụ gaewepụta ozi na ịkwado etu e si eji NIMS eme ihe. Ọzọkwa, e nwere ike inweta ozi nke
NIMS n’Ụlọọrụ Mkpọrụrụ Ọrụ ọnlaịn dị nke na-arụ ọrụ awa iriabụọ na anọ (24 hours)
n’ụbọchị. Ọzọkwa, a ga-ahọpụta kọmpịnị nzipụozi kurịa ndị ga-ahụ na e nyeruru slip NIN
na Kaadị Njimara Kemba (National Idintity Cards) ruru aka n’oge kwesịrị. I nwere ike
ịnara nke gị n’onwe gị site n’ịbịa n’Ụlọọrụ Ndebanyeaha (Registration Centre). NIMC naagbasi mbọ ike iziru nwaamaala ọbụla na onye ọbịa iwu kwadoro obibi yanzikọrịtaozi NIMS
iji nweta ihe bụ mkpa ya n’ihe karịrị asụsụ Naịjirịa anọ (4) dị icheiche ndị gbara
15
SISTEM NJIKWA NJIMARA KEMBA
ọkpụrụkpụ. A ga-enwekwa nzikọrịtaozi na ịgbanwe njikwa pụtara ihe iji nwee nkwụsiike
nye mgbanwe ọnọdụ na mkpa ọ dị maka usoro a tụpụtara n’okpuru NIMS.
Maka ajụjụ kpọtụrụ anyị site na:
+234 702 5420 706-9 +234 704 0144 452 – 7
Weebsaịti: http://www.nimc.gov.ng
Email: [email protected]
National Identity Management Commission
11, Sokode Crescent, Off Dalaba Street,
Zone 5, Wuse,
P.M.B. 18, Garki,
Abuja – Nigeria.
16
SISTEM NJIKWA NJIMARA KEMBA
17